Commons: Ajụjụ na Azịza nke Wiki Loves Monument

From Wikimedia Commons, the free media repository
Jump to navigation Jump to search
This page is a translated version of a page Commons:Wiki Loves Monuments/FAQ and the translation is 95% complete. Changes to the translation template, respectively the source language can be submitted through Commons:Wiki Loves Monuments/FAQ and have to be approved by a translation administrator.
Outdated translations are marked like this.


WLM 2023 Participating countries Uploaded images Organizers FAQ Help desk For organizers

Ajụjụ gbasara oru ngo a

Gịnị bụ Wiki Loves Monuments?

Wiki Loves Monument bụ asọmpi foto ọha nke a na-agwa ndị na-agụ akwụkwọ na ndị na-akwado Wikipedia ka ha see foto ncheta site na mba ndị na-esonye ma bulite ha na Wikimedia Commons. Ebu ụzọ hazie asọmpi a n'afọ 2010 na Netherlands ma na-ahazi ya ugbu a n'ọtụtụ mba gburugburu ụwa. Ihe ncheta nke Wiki Loves Monument achịkọtala ihe dị ka nde foto abụọ n'ime afọ gara aga nke enwere ike iji na Wikipedia nakwa na Wikimedia Commons, nke Guinness Book of World Records matara dị ka asọmpi foto kacha ukwuu n'ụwa.

Kedu oke ọrụ a metụtara?

Asọmpi foto a na-elekwasị anya na ihe nketa wuru. A na-akpọ ndị na-ese foto, ndị na-enwe ntụrụndụ na ndị ọ na-anụ ọkụ n'obi ihe nketa ka ha nyefee foto nke ụlọ ndị dị na ndepụta nke ihe nketa arụpụtara dị na Wikipedia na Wikidata. A haziri emume Wiki Loves Monument n'ọtụtụ mba, na nkọwa nke ihe mejupụtara 'ihe ncheta' dị iche iche. Ndị na-ahazi obodo na-ahụ maka ịchọta nkọwa kacha dabara adaba maka obodo ha, na-abụkarị nke a bụ ndepụta gọọmentị nke ihe nketa echedoro ma ọ bụ ama ama nke gọọmentị nyere. Naanị onyonyo nke ihe ncheta na 'mba ndị na-esonye' bụ ndị e nwere ike inyefe.
Otú osila dị, e nwere ọtụtụ ndụmọdụ n'ozuzu bụ nke a na-ahụkarị maka mba niile na-ekere òkè iji mee ka asọmpi ahụ kwekọọ na ibe ya; A ga-akọwapụta ndụmọdụ ndị a (ma ọ bụ iwu) n'okpuru.

Kedu onye kwụ ya n'azụ?

Wiki Loves Monument dị na nke ọtụtụ asọmpi mba, ọ dịkwa n'ọkwa mba nke ndị otu obodo Wikimedia na-ahazi site n'enyemaka sitere na mpaghara Mgbakwunye Wikimedia. Na mba ụfọdụ ndị ọ na-anụ ọkụ n'obi na ndị otu ihe nketa etinyela aka n'ịhazi asọmpi a.
Ndị Wiki Loves Monuments International Team na-akwado asọmpi a n'ọkwa mba ụwa bịakwa nwee enyemaka nke ndị ọrụ afọ ofufo gburugburu ụwa. Otu a na-etolite ma na-edobe akụrụngwa nke ndị otu mba na-eji (dịka ọmụmaatụ, ngwaọrụ maka ịchọta ihe ncheta na ikpe ikpe) ma hụ na njedebe nke mba ụwa dị mma.
Na mkpokọta, Wiki Loves Monuments bụ emume nke ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo na-ahazi gburugburu ụwa.

E nwere m ike i nweta ezi nkọwa ngwa ngwa gbasara asọmpi ahụ?

N'ezie! Ị nwere ike ịchọta ntụle nke mba niile na-ekere òkè n'afọ dị iche iche, yana ọnụ ọgụgụ ntinye akwụkwọ na mba ọ bụla na ibe nlele a. Anyị chịkọtara isi ozi na tebụlụ Commons:Wiki Loves Monuments.

E nwere m ike i bulite foto site na ihe karịrị otu obodo?

Ee! Ị nweere ike ibugo foto dị ka ịchọrọ, site na obodo niile ịchọrọ - ọ bụrụhaala na ha na-ekere òkè na nke Wiki Loves Monument n'afọ a.
Enweghị mmachi na ọnụọgụ asọmpi mba ị nwere ike isonye na ya; Ọ bụrụ na i nwere foto site na mba ndị ọzọ (ọbụlagodi ma ọ bụrụ na e weere ha n'oge gara aga), i nwere ike nyefee ha na asọmpi ahụ ma bawanyekwuo ohere gị iji nweta ihe nrite!

Ajụjụ Nzukọ

Obodo m ga-enwe mmasị isonye. Abịara m n'azụ oge?

A na-ahazikarị ihe emume nke Wiki Loves Monument n'ọnwa Septemba, mana kemgbe afọ 2020 ọ bụzi n'ọnwa Ọktọba. I ji n'oge malite na nhazi, bụ ọrụ ka mma ị nwere ike ịrụ. Ọ dabere ntakịrị na obodo ole ọrụ kwesịrị ịrụ iji guzobe asọmpi opekampe - ọkachasị ịchọta na ibipụta ndepụta ihe ncheta nwere ike na-ewe oge na nke mbụ. Biko kpọtụrụ ndị otu mba ụwa ma ọ bụrụ na ịchọrọ inweta atụmatụ ma ị ka nwere ike isonyere.
Ọ bụrụ na ịchọrọ ịma mgbe ị ga amalite - mbido n'oge ka mma! I nwere ike ileba anya na usoro oge anyị zuru ezu, mana nke ahụ bụ maka nhazi mgbalị zuru oke na ụwa zuru oke. Ọtụtụ mba ndị na-esonye na nke mbụ, chọrọ ọnwa ole na ole iji webata ndị ọrụ afọ ofufo, malite mmekọ na ịchọta ndị nkwado, dozie ndepụta ncheta ma guzobe ụdị kwesịrị ekwesị na Wikimedia Commons.
Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị na-eme ya na obodo gị, ka ịmalitere n'oge ga-akara gị mma. Ọgwụgwụ ọnwa Eprel bụ ebumnuche mara mma ịmalite nke ọma. Mgbe ụfọdụ ị ka nwere ike isonyere nke ọma n'ime ọnwa Ọgọst, mana nke a dabere na obodo gị, ma chọọ ka ndị otu gị tinyekwuo oge n'ime oge dị nta.

Kedu ka m ga-esi sonye?

Ọ dị mfe n'ezie, dị mfe ma na-atọ ụtọ! Ọ bụrụ na ịchọrọ ịhazi ihe emume nke Wiki Loves Monument na mpaghara gị, biko hụ na ndepụta nke mba ndị na-ekere òkè; Ọ bụrụ na ịchọtala obodo gị na ndepụta ahụ, biko kpọtụrụ onye edenyere na-ahụ maka nke ahụ, ma sonyekwara ha! Ha na-enwekarị inye ekele maka enyemaka nile ha pụrụ inweta.
N'agbanyeghị, ọ bụrụ na obodo gị abanyebeghị na ndepụta ahụ, ọ na-apụtakarị na enwebeghị mmasị zuru oke ma ọ bụ ikike afọ ofufo n'ịhazi emume nke Wiki Loves Monument. Ugbu a bụ ohere gị ibido asọmpi ahụ! Nzọụkwụ mbụ dị mma bụ ịkpọtụrụ ndị otu mba ụwa, ka ịhụ ma onye ọ bụla ọzọ egosila mmasị obodo gị na nzuzo. N'ụzọ dị otú ahụ, enwere ike ịkpọ gị, wee sonye na mbọ. Ị nwekwara ike lelee ibe akwụkwọ a nke ihe achọrọ iji hazie emume nke Wiki Loves Monument na obodo gị. Ị nwekwara ike ịdenye aha na mba ụwa ndepụta nzipu ozi wee webata onwe gị ebe ahụ. Nke a bụ ebe kacha mma ịjụ ajụjụ na enyemaka. Kpọnye aha na Wiki Loves Monuments announcement mailing list nke na-enweghị mkparịta ụka sara mbara, mana na-elekwasị anya na ozi kachasị mkpa, ọkachasị nke dị nso n'asọmpi ahụ.
Ọ dịghị mkpa ka ị bụrụ onye otu Wikimedia mpaghara gị iji hazie emume nke Wiki Loves Monument n'obodo gị, mana ọ bụrụ na e nwere nke dị na mpaghara gị, biko gbalịa ịbịakwute ha wee nweta nkwado ha! N'aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị bụ onye otu Wikimedia mpaghara gị, biko jide n'aka na ị na-etinye ndị obodo n'ọrụ a dịka o kwere mee - ị ga-achọ enyemaka ha n'ezie n'imezu ndepụta nke ihe ncheta, mezie mmejọ ndị nwere ike ime, na n'ọtụtụ akụkụ nke nkwadebe.

E chere m na achọrọ m enyemaka. Kedu ka ị ga-esi kwado m?

Nke mbụ, daalụ maka inwe obi ike ịrịọ maka enyemaka. Enwere ọtụtụ ahụmahụ ugbu a, anyị niile ga-achọ ịhụ na i mere nke ọma. Ndị otu mba ụwa nwere ike inyere gị aka n'ọtụtụ ihe, ọkachasị ndị metụtara akụkụ teknụzụ nke nkwadebe: Anyị ga-ewepụta akụrụngwa maka ibugo na ikpe onyonyo, yana nwee ike inyere gị aka na-akwadebe ebe nrụọrụ weebụ mpaghara gị, ndepụta ihe ncheta na ngwaọrụ.
Anyị nwekwara ike inye aka na nkwekọrịta ụghalaahịa na Wikimedia Foundation (ọ bụrụ na obodo gị enweghị ngalaba Wikimedia ma ịchọrọ iji ụghalaahịa Wikimedia ya n'ịkwalite asọmpi mpaghara gị). Anyị nwekwara ike inye ndụmọdụ gbasara onye i nwere ike ịgakwuru maka mmekọ ga-ekwe omume (ọ bụ ezie na ọ na-abụkarị na Europe).
Na mgbakwụnye, ọ bụrụ na ị na-eche na nzụkọ mkpata echiche na obodo gị na otu n'ime anyị ga-enye aka, biko mee ka anyị mara, na anyị ga-agbalị inyere gị aka; anyị nwere obere mmefu ego iji nabata ma ọ bụrụ na isi otu gị ma ọ bụ otu Wikimedia mpaghara enweghị ego.
Ọ bụrụ na i nwere arịrịọ akọwapụtara nke ọma, biko hụkwa anya na ibe akwụkwọ who's who iji hụ onye i nwere ike ịkpọtụrụ ozugbo gbasara mkpa gị. Ị nwere ike ịhapụ ajụjụ na Helpdesk.

Foto ole nwere mmeri na emume nke Wiki Loves Monument nke ime obodo nta?

Asọmpi mba ọ bụla na-ekpebi foto ole ha nwere ike ma chọọ inye ihe nrite. Ọ dị gị n'aka! Iji nye ihe atụ, na mbipụta nke afọ 2011, e nwere foto 22 na-emeri emeri na Belgium, ebe n'otu afọ ahụ, ndị juri Romania kpebiri ịkpọ naanị ndi mmeri 3.
N'agbanyeghị, maka ịdị mma, izi ezi na ihe ndakọrịta, asọmpi mba ọ bụla nwere ike nyefee nhọpụta 10 na ọkwa mba ụwa nke asọmpi ahụ; Ọtụtụ mgbe, ndị a bụ ndị mmeri mpaghara na, mgbe ọ bụla ọdabara, ụfọdụ foto ndị ọzọ (nke a na-akpọkarị nkwanye ugwu ) dị ka ndị ọkà íkpè mpaghara kpebiri.

Ọ dị mkpa ịdebanye aha ngalaba wikilovesmonuments.TLD dị elu?

Azịza dị mkpirisi bụ: "Mba."
I nwere ike ịtọ "ibe ọdịda" gị na webụsaịtị raara onwe ya nye dịka https://www.wikilovesmonuments.org.uk, ma ọ bụ na ibe na Wikimedia Commons dị ka Commons:Wiki Loves Monuments 2021 in Ireland. N'agbanyeghị, ọ bụrụ na isi ma ọ bụ otu Wikimedia mpaghara gị nwere ike ịzụrụ ngalaba ọkwa kachasị elu nke obodo gị, anyị ga-atụ aro ka ị mee ya; ọ bụrụgodị na ị kpebie na ngalaba ọzọ, ị ga-echebe TLD site na ihe ndị na-adịghị mma cybersquatting (nke emelarị ụfọdụ mba).
Ọ bụrụ na inweghị ike ịdebanye aha ngalaba ọkwa dị elu na obodo gị n'ihi nsogbu ndị ọzọ - dịka ọmụmaatụ n'ihi na enweghị isi Wikimedia n'obodo ma ọ bụ isi nke dị ugbu a enweghị ike ịzụta ngalaba ma ọ bụ nnabata - biko wetara anyị nsogbu ahụ site n'ịkpọtụrụ ndị otu mba ụwa ozugbo; Enweghị usoro akọwapụtara nke ọma maka otu esi eme ihe banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ, mana anyị ga-agba mbọ inye aka.

Kedu otu esi edozi webụsaịtị maka obodo m?

Ọtụtụ n'ime ndị otu mba na-eji blọọgụ Wordpress ma ọ bụ ibe na Wikimedia Commons. Anyị mepụtara isiokwu Wiki Loves Monument na WordPress nke i nwere ike iji, ma i nwere ike iji ibe si na obodo ọzọ masịrị gị ma ọ bụrụ na ịchọrọ ịrapara na Wikimedia Commons. Nkọwa niile gbasara otu esi edobe webụsaịtị Wordpress dị na PDF document. Maka ajụjụ, biko rụtụ aka na ndepụta nzipu ozi.
Mba ụfọdụ na-enwe mmasị iji nrụnye MediaWiki raara onwe ya nye, ngwanro na-akwado weebụsaịtị a. Enwere WikiLovesMonuments extension maka MediaWiki nke na-achịkọta ụfọdụ ozi WLM wee gbakwunye oghere dị n'akụkụ nwere njikọ na webụsaịtị nke mba ndị ọzọ na-esonye.

E nwere ihe karịrị otu asụsụ a na-asụ na obodo m, kedu ka m ga-esi mee ya?

Ịhazi emume nke Wiki Loves Monument n'obodo nwere ihe karịrị otu asụsụ ga-achọ n'ezie mgbalị mgbakwunye, karịsịa na ntụgharị asụsụ. N'ezie, ọnọdụ a emeworị kemgbe afọ 2011 (Belgium na Switzerland), na e nwere ụfọdụ ahụmahụ anyị nwere ike ịkekọrịta.
Nsogbu kachasị (ma ọ bụ "ohere") ga-abụ ịmepụta ndepụta ndị yiri ya na asụsụ abụọ ma ọ bụ karịa ma bipụta ha na Wikipedia kwesịrị ekwesị; Naanị ihe achọrọ bụ iji otu ihe nchọpụta ihe ncheta na ndepụta niile (e nwere ike ịdepụta ozi ndị ọzọ). Biko jụọ na Oche enyemaka maka ozi ndị ọzọ.
Usoro nbudata n'onwe ya, nke na-eji UploadWizard na ihe mkpuchi nke Wiki Loves Monument, nwere ike ịtụgharị ya n'ọtụtụ asụsụ dịka achọrọ ya. N'afọ 2011, obodo ọ bụla nwere UploadCampaigns n'asụsụ gọọmentị ya (ma ọ bụ asụsụ dị iche iche) yana asụsụ Bekee maka ndị na-asụghị asụsụ obodo nwere ike chọọ isonye na asọmpi a. Ndị ọrụ afọ ofufo na-akwado ntụgharị asụsụ, gụnyere ndị nhazi mpaghara, ma biputere ya na Wikimedia Commons site na enyemaka sitere na ndị nchịkwa; A na-eji atụmatụ yiri nke ahụ akwado CentralNotice ọkọlọtọ na Meta.

Kedu ihe ndị mmekọ tụrụ aro maka emume nke Wiki Loves Monument?

Ịhọrọ ndị nrụkọọrụ maka emume nke Wiki Loves Monument nke mpaghara bụ otu n'ime ihe kachasị mkpa obodo ọbụla kwesịrị ikpebi n'onwe ya, naanị ihe anyị nwere ike ịnye gị bụ ndụmọdụ gbasara onye ị nwere ike ịkpọtụrụ. Enwere ọtụtụ ọdịiche dị n'etiti otu esi ahazi ngalaba ihe nketa omenala site na mba ruo na mba.
E nwere otu odina mkpa ụdị ndị nrukooru mmadụ nwere ike ịchọpụta:
  1. Ndị Nrụkọọrụ gọọmentị - ọ ga-adị mkpa ka ị chịkọta ndepụta ebe ncheta, na ịnweta ndetu gọọmentị gị nwere nkọwa zuru oke dị ka o kwere mee ga-enyere gị aka. Ịmekọrịta ha nwere ike ịba uru maka akụkụ abụọ ahụ kwa, n'ihi na ndị mmadụ ga-enwe ike ịhụ mmejọ na ndepụta mbụ nke a ga-akọghachi azụ na onye mmekọ. Mba ụfọdụ nwere ike ịmalite imekọ ihe ọnụ ebe ha kpọrọ ndị sonyere ha ka ha nye gọọmentị nzaghachi ihe na-efu na ndepụta ebe ncheta.
  2. Ndị nrụkọọrụ ọha - ndị ahụ bụ ndị nrụkọọrụ nwere ike inyere gị aka ị nweta okwu ahụ, iru ndị na-ege ntị na mgbasa ozi dị iche iche; ọmụmaatụ òtù na-abụghị nke gọọmentị, òtù ndị na-ese foto, òtù ụlọ akwụkwọ, wdg. I nwekwara ike itụle ndị mmekọ nwere nnukwu mgbasa ozi ọha na eze, ma ọ bụ magazin, akwụkwọ akụkọ wdg.
  3. Ndị nkwado - ha nwere ike inye gị onyinye maka ndị meriri na ikekwe kwụọ ụfọdụ ụgwọ mmemme ahụ.
Ndepụta ndị nrụkọọrụ nwere ike ime nke akwadoro n'ime afọ 2011; biko hụ ma ọ bụrụ na aro ndị a metụtara obodo gị.

Kedu maka efe elu?

Ma maka mgbagha na ebumnuche mmefu ego, ndị otu mba ụwa agaghị emepụta ákwà elu maka Wiki Loves Monument. Ọ ga-adị ọnụ ahịa ala karịa ma ọ bụrụ na ndị otu mpaghara emepụta ákwà elu maka ebumnuche nke ha karịa ibuga ha gburugburu ụwa, na-etinyeghị ikwu maka ọdịiche dị n'etiti mba ndị ahụ, yana ụdị ọrụ achọrọ iji lekọta mbupu.
Iji nyere gị aka n'ichepụta na mmepụta nke akwa elu, e nwere akara ngosi abụọ e nwere ike ime,otu maka mbipụta agba ọcha na oji, na otu maka mbipụta agba atọ. Jiri nke masịrị gị ma nwee afọ ojuju!

Kedu otu m ga-esi nweta ego maka atụmatụ anyị?

Anyị na-atụ aro ka ị buru ụzọ gbalịa kpuchie mmefu gị site n'enyemaka nke ndị nkwado. N'ọtụtụ mba, ọ ga-ekwe omume ịchọta ndị nkwado iji kwụọ ụgwọ maka ihe ma ọ bụ ọrụ ị ga-akwụrịrị ụgwọ maka onwe gị (ihe nrite, ihe ọma, ihe nkwado, wdg). Ọ bụrụ na e nwere Isi mpaghara Wikimedia na obodo gị, ọ ga-ekwe omume na ha nwere ike ịkwụ ụgwọ ụfọdụ.
Mgbe ị na-achọta ndị nkwado maka asọmpi gị ma ọ bụ nweta nkwado site na ngalaba Wikimedia mpaghara agaghị ekwe omume, a ka nwere ụzọ nke atọ. Wikimedia Foundation na-enye onyinye, ọkachasị maka obere ọrụ. Biko lelee usoro onyinye nke Wikimedia Foundation - ọ dị ka onyinye ngwa ngwa kacha dabara adaba.

Ebee ka m nwere ike ịhụ ọnụ ọgụgụ dị mkpa, nyocha, wdg?

N'ime afọ ndị gara aga, achịkọtala ụfọdụ ọnụ ọgụgụ, e mewokwa nyocha. Nke a bụ nkọwa nke ndị a (ma eleghị anya ọ gaghị agwụ agwụ):

  • Eziokwu ndị bụ isi:lee n'elu
  • Ụfọdụ ngwaọrụ ọnụ ọgụgụ na-enyere aka:

Commons:Wiki Loves Monuments 2023/Tools

Ajụjụ gbasara iwu asọmpi

Kedụ ndị bụ isi iwu?

Usoro iwu ma ọ bụ "ịtụ aro" iji mee asọmpi bụ:
  1. Foto niile na-esonye na asọmpi kwesịrị ịbụ nke onwe sere nakwa nke onwe bulitere;
  2. Enwere ike ibugo ya na Septemba na Ọktọba (a ga-enyocha ndị nke pụrụ iche n'otu n'otu), na Wikimedia Commons;
  3. Ikikere ndabara bụ Creative Commons Attribution-Share Alike 4.0 (CC-BY-SA 4.0);
  4. Foto niile tozuru oke ga-enwerịrị ihe njirimara, nke ndị sonyere na-enye n'oge mbugo;
  5. Ndị sonyere kwesịrị inwe akara ozi ịntanetị ha na Wikimedia Commons (ma ọ bụ ebe ha bugoro foto ha na ya) ka ha wee tozuo maka ihe nrite;
  6. Asọmpi mba ọ bụla nwere ike ịhọpụta foto iri na asọmpi mba ụwa.

Kedụ ụdị teknụzụ a chọrọ maka foto?

Enwebeghị ihe gbasara teknụzụ izugbe maka foto a. Foto niile nke onwe sere na nke onwe bulitere ewepụtara bụ ndị mezuru iwu ndị ọzọ bụ isi (lee n'elu) ma dabara na Wikimedia Commons metụtara nabatara n'asọmpi ahụ, dị ka isi ihe mgbaru ọsọ nke Wiki Loves Monument bụ ịnakọta ọtụtụ foto eji maka Wikipedia dị ka o kwere mee. Ndị nhazi mpaghara na ndị ọkà íkpè mpaghara nwere ike ịkọwapụta ihe ha chọrọ n'onwe ha, wee họrọ ndị meriri ha.
Ụfọdụ ndị otu Wikimedia Commons ekwuputala nchegbu na ụfọdụ foto ebugoro maka emume nke Wiki Loves Monument bụ ndị nke na-adịchaghị mma. Ọ ga-emegide oghere nke asọmpi ịtọlite ​​​​nkà na ụzụ ọ bụla chọrọ maka foto n'ewepụghi ikpe ikpe. Otú ọ dị, edeturu ụfọdụ echiche gbasara otu esi enyere ndị sonyere aka melite ogo foto ha.

Kedu otu esi etolite ndị ọkà íkpè mpaghara ime obodo?

Emume Wiki Loves Monument abụghị maka foto ọ bụla : ọ bụ maka foto ncheta; banyere foto nke ihe ncheta mara mma ; na gbasara foto ndị mara mma nke ihe ncheta dabara na ebumnuche nrụtụaka nke Wikipedia (na ọrụ Wikimedia ndị ọzọ). N'ihi ya, e kwenyere na ndị ọkà íkpè kwesịrị iburu n'uche ụkpụrụ ndị ahụ niile mgbe ha na-eme mkpebi ya na ndị meriri, ma na mpaghara ime obodo ma na mba ụwa.
Iji mee ka ụkpụrụ atọ ahụ guzozie—nakwa itinye aka na ndị nkwado mpụga na ndị nrụkọọrụ—ihe ka ọtụtụ n'ime ndị ọkà íkpè nke afọ gara aga bụ ndị ọkachamara na-ese foto, ndị ọkachamara n'ihe nketa ọdịnala na ndị Wikimedia, ndị were mkpebi ha n'otu ụzọ. Na mba ụfọdụ enwekwara ntuli aka e mepere maka ọha, nke ndị Wikimedia na-ahọrọ ọkacha mmasị ha, mana nke a kwesịrị iwere naanị ihe mgbakwunye na mkpebi oge niile nke ndị ọkà íkpè.

Ajụjụ teknụzụ

Kedu ngwaọrụ a ga-eji bulite foto maka Wiki Loves Monument?

N'ịgbaso ahụmịhe afọ gara aga, anyị ga-eji UploadWizard site na ihe mkpuchi Wiki Loves Monument dị mfe (Mbulitemkpọsa). Obodo ọ bụla nwere mkpọsa mbulite nke ya nke na-agbakwunye ndebiri ziri ezi na faịlụ ebugoro. Mgbe ụfọdụ, a na-emewanye nke a ka ọ dị mfe, site na ịnye njikọ mbulite ozugbo maka ihe ncheta dị iche iche site na ndepụta ihe ncheta na ngwaọrụ dị ka Monumental. Ị nwere ike ịnwale mkpọsa mbulite, hụ ibe a.
E nwere ike ibugo foto site na iji ngwaọrụ ndị ọzọ (e.g. Commonist, Up!), mana dịka nke a chọrọ ịmatakwu wiki markup na Wikimedia Commons n'onwe ya, n'ime afọ ndị gara aga, ọ bụ naanị ndị ndezi nwere ahụmahụ ji usoro ndị ahụ

Kedu maka iji ọkọlọtọ CentralNotice?

Dịka na mbipụta ndị gara aga, anyị ga-eji ọkọlọtọ CentralNotice ịkpọ ndị ọbịa ka ha sonye na asọmpi ahụ. Ọkọlọtọ a ga-adabere na mpaghara ala nakwa na asụsụ onye ọrụ, a ga-ahụkwa ya na ọrụ Wikimedia niile n'ime ọnwa asọmpi niile. Ha ga-eduzi onye ọrụ gaa na webụsaịtị asọmpi obodo ha iji nye ozi niile achọrọ isonye.
Hụ Commons:Wiki Loves Monuments 2022/CentralNotice maka ozi zuru ezu na ntụgharị asụsụ nke ederede ejiri na ọkọlọtọ. Biko tinye url nke ibe ọdịda nke obodo ọ bụla na-esonye na tebụl ahụ.

Kedu ka m ga-esi kepụta ndepụta ihe ncheta?

Iji sonye na asọmpi a, a na-atụ aro ka inwe ndepụta ncheta na Wikipedia, ka ndị sonyere mara ihe enwere ike ịse foto. Ndepụta ihe ncheta ndị a nwere maka ihe ncheta ọbụla ihe nchọpụta pụrụ iche iji chọpụta otu ihe ncheta n'ụzọ dị mfe. N'ime ndepụta ndị a i nwere ike itinye njikọ ozugbo na ọkachamara mbulite pụrụ iche maka obodo gị nke na-emeju mkpọsa mbulite ka ọ dị mfe isonye. Hụ maka ozi ndị ọzọ gbasara imepụta ndepụta ncheta n'ibe a. Mgbe emepụtara ndepụta ihe ncheta, enwere ike ịgbakwunye ha na nchekwa mgwa mmuta ncheta iji mee ka ngwaọrụ ndị bara uru (nke na-eji ndepụta ndị a).

Nakwa Kedu maka ndetu sitere na ncheta dị na Wikidata?

Ọtụtụ mba na-ebuga ndepụta ha site na Wikipedia n'ime nchekwa ngwa mmụta Wikimedia Wikidata, nke n'aka nke ya na-enye ohere ịmepụta ndepụta ncheta akpaaka na Wikipedia mpaghara gị. Ndepụta akwụkwọ ntuziaka na akpaaka dịkwa mma maka Wiki Loves Monument.
Ozi ndị ọzọ dị na Wikidata na Wiki Loves Monument ka atụrụ anya na a ga-agbakwunye n'oge adịghị anya. Ụdị ngwa mmụta maka ngwa mmụta ahaziri ahazi na ihe ncheta adịlarị na Commons:Wiki Loves Monuments/Structured data.

Ebee ka m nwere ike ịhụ ozi gbasara ebe ngwa mmụta ncheta?

Akwụkwọ maka ebe nchekwa nke ngwa mmụta ncheta dị na Commons:Monuments database.

Kedu ngwaọrụ ndị ọkà íkpè ga-eji họrọ foto?

Ọ bụ ezie na mba ọbụla nwere ike ikpebi ngwá ọrụ ma ọ bụ usoro ọ ga-eji họrọ foto ndị na-emeri emeri, e mepụtala ngwá ọrụ ngwanrọ na-elekwasị anya ikpuchi mkpa nke ọtụtụ ọnọdụ enwere ike, dabere na ahụmahụ sitere na afọ gara aga. Commons: Montage bụ ngwa ọrụ nke, kemgbe afọ 2016, ọtụtụ asọmpi Wiki Loves na-eji. Nkọwa nke ngwá ọrụ dị na ibe ọrụ, ịrịọ mkpọsa maka asọmpi mba gị kpọmkwem, biko gaa na ibe okwu.

Enwere ike ịchọta ndepụta ụdị ngwaọrụ ndị ọzọ maka emume Wiki Loves Monument na ebe a.

Ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ọ bụla gbasara CentralNotice, mbulite mkpọsa ma ọ bụ ndabiri emetụtara, yana ndị ọzọ, ejiri mee ihe maka emume Wiki Loves Monument, biko jụọ ha na ibe okwu. Ndị otu mba ụwa na-ekiri ibe okwu a.


Ị nwekwara ike ịkpọtụrụ anyị na IRC na ọwa #wikilovesmonuments na freenode. Access webchat → maọbu gaa n'ebe ahụ in your IRC client ma jụọ maka Romaine.