Wiki Loves Africa 2024/Isiokwu

From Wikimedia Commons, the free media repository
Jump to navigation Jump to search
This page is a translated version of a page Commons:Wiki Loves Africa 2024/Theme and the translation is 100% complete. Changes to the translation template, respectively the source language can be submitted through Commons:Wiki Loves Africa 2024/Theme and have to be approved by a translation administrator.

Wiki Loves Africa website  Wiki Loves Africa on Facebook  Wiki Loves Africa on Twitter  Wiki Loves Africa on Instagram  Wiki Loves Africa on YouTube  Media information  Wiki Loves Africa's mailing list  What's going on in my country?  Images uploaded in 2024 



Isiokwu: Afrịka Na-Ékè



Isiokwu a bụ Afrịka Na-Ékè na-àjá mma bụ nkepụta, mmepụta, nakwa/maọbu ọrụrụ nke ihe dị iche iche site n'aka ndị Afrịka n'akụkụ niile nke Afrịka gbaa gburugburu. Dịka isiokwu, Afrịka Na-Ékè metụtara n'ozuzu òkè nkepụta ǹkà n'ụzọ niile: ǹkà, ịchọ mma, ihe nkiri, ịgba egwú, akwụkwọ ọgụgụ, mmepụta na ịchọ ákwà oyiyi mma, ihe oňụňụ, isi nri n'akụkụ okporo ámá, iji ụzọ ọdịnala dị iche iche maọbukwanu ụzọ ọgbaraọhụrụ dị iche iche emepụta ihe. O nwekwara ike idetukọta nkepụta, mmepụta maọbu nrụgharị n'ụzọ ọgbaraọhụrụ ihe ha dị iche iche a na-ere ere maọbu mmepụta ha n'ụlọ ọrụ mmepụta dị iche iche n'ógó bụrụ ibu, dịka nrụgharị nri oriri, mmepụta ihe ọňụňụ, mmepụta seramiiki, ákwà, nakwa ihe ndị eji ebi n'ụlọ nakwa mmepụta n'ógó bụrụ ibu, ọmụmaatụ, mgbari ígwè, ọrụ njinia maọbu ịmepụta gilaasị.

Afrịka Na-Ékè nwere mmasị ya n'usoro nkepụta ihe karia na ihe ekepụtara ma na-elegara anya n'ịja mma nakwa igosipụta mmụọ nkepụta ihe nke ndị mmadụ dịka ọ na-eme. Ihe nlekwasị anya nke onye na-ese foto maọbu onye na-emepụta ihe nkiri maọbu onye na-egosipụta naanị ụ̀dà kwesịrị ịbụ n'iseta usoro nke mmepụta maọbu nkepụta ihe, n'abughị na ihe ahụ ekepụtara n'onwe ya. Ọ bụrụ na egosipụta ihe ekepụtara, biko si emekwala ya ka ọ bụrụ ya bụ ebe nlereanya kpọmkwem nke ihe Osise ahụ.

Isi sekpụ ntị na ihe ndị esere ga-enwe mmeri na-elekwasị anya na ihe ndị gosipụtara usoro (nke mmepụta maọbu nkepụta ihe) n'abughị na ihe arụpụtara n'onwe ya.

Ngwa lee ụfọdụ ntụpenye azụ na ihe ndị a gá-elekwasi anya gbasara isiokwu


Isiokwu Gasị Nkepụta ihe, Nrụgharị ihe, Mmepụta ihe, Ọrụ ngo,.Ihe ndị Emere n'Afrịka, Ọrụ ǹkà, Njikọ, Ọ̀gbọ́ njikọ gasị, Ụlọ ọrụ nrụpụta, Ụlọ ọrụ mmepụta ihe eji arụ ákwà a na-eyi n'ahụ Ọ̀gbọ́ nrụpụta ihe Nkwalite nke ihe ndị arụrụ arụ Nnyocha na nkwalite Ụlọ ọrụ ọdịnala Ǹkà Ịchọ mma Nkepụta site n'uche mmadụ Ihe ndị si n'ụbụrụ Nkụkọta ígwè

==Ntụpenye azụ maka ngalaba gasị ndị ga-akpaki nakwa ndị a aga-egosipụta n'ịntaneetị

Existing Categories
Name Link
Nrụpụta Category:Production
Ị́kpa ihe Category:Weaving
Mmepụta ite Category:Manufacture of pottery
Ngwá egwu Category:Manufacture of musical instruments
Nri Category:Manufacture of food and cooking
Kọfị̀ Category:Manufacture of coffee
Akwụkwọ ide ihe Category:Manufacture of paper
Ịfụkeli gilaasị Category:Glassblowing
Ọrụ osisi Category:Woodworking
Mmepụta ìgbé ntinye mmanya Category:Crates making
Ịkpụ ihe Category:Sculpturing
Ndị ọrụ aka ebe ha nọ ọrụ Category:Artisans at work
Ụmụ nwoke na-ákpà ihe Category:Men weaving
Ịkpa ǹkàtà Category:Basket makers at work
Ịkpụ nkume Category:Stone carvers at work